14Ndị Livayị: Shemaya nwa Hashub, nwa Azrikam, nwa Hashabaya onye ikwu Merari.
15Bakbaka, Heresh, Galal, na Matanaya nwa Mika, nwa Zikri, nwa Asaf;
16Ọbadaya nwa Shemaya, nwa Galal, nwa Jedutun; na Berekaya nwa Asa, nwa Elkena onye biri nʼobodo nta ndị Netofa.
17Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ si nʼebo Livayị: Shalum, onyeisi ha, Akub, Talmon, Ahiman na ụmụnna ha.
18Ha nọ ruo ugbu a nʼọnụ ụzọ ama Eze, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ha bụ ndị nche ọnụ ụzọ ama si nʼọmụma ụlọ nke ndị Livayị.