3Ndị si nʼebo Juda, na Benjamin, na Ifrem na Manase lọta bịa biri na Jerusalem bụ ndị a:
4Utai nwa Amihud, nwa Omri, nwa Imri, nwa Bani, onye ikwu Perez, nwa Juda.
5Nʼezinaụlọ Shilo: Asaya nwa mbụ ya na ụmụ ya ndị ikom.
6Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu (690).
7Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;