6Ụmụ Zera, Jeuel so nʼime ha. Ọnụọgụgụ ndị Juda niile lọtara dị narị isii na iri itoolu (690).
7Ụmụ Benjamin: Salu nwa Meshulam, nwa Hodavaya, nwa Hasenua;
8na Ibneia nwa Jeroham; Elaa nwa Uzi, nwa Mikri; na Meshulam nwa Shefataya, nwa Reuel, nwa Ibnija.
9Ha niile bụ ndịisi ezi. Ọnụọgụgụ ndị Benjamin niile lọtara ndị e dere aha ha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ ha, dị narị itoolu na iri ise na isii (956).
10Ndị nchụaja: Jedaya, Jehoiarib na Jakin;