1 Ndị Kọrint 10

Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.

1 Corinthians 10:17 (UKJV) For we being many are one bread, and one body: for we are all partakers of that one bread.

15Ana m agwa ndị nwere uche okwu, unu onwe unu tulenụ ihe m na-ekwu.

16Iko ngọzị ahụ nke anyị na-agọzi, ọ bụghị iketa oke site nʼọbara Kraịst? Achịcha nke anyị na-anyawa, ọ bụghị iketa oke nʼahụ Kraịst?

17Nʼihi na otu achịcha dị, ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, anyị bụ otu ahụ, nʼihi na anyị niile na-eketa oke nʼotu ogbe achịcha ahụ.

18Chetanụ ka ndị Izrel siri mee: ọ bụ na ndị na-eri ihe eji chụọ aja abụghị ndị nnwekọ nʼebe ịchụ aja?

19Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Na arụsị, maọbụ ihe a chụrụ nʼaja nye arụsị bụ ihe ọbụla, maọbụ na ọ bụghị ihe?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.