23Ị na-asị, “Enwere m ike ime ihe niile m maara na m kwesiri ime,” ma ọ bụghị ihe niile ga-abara m uru. “Enwere m ike ime ihe niile m maara ziri ezi,” ma ọ bụghị ihe niile nwere ike inyere anyị aka.
24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.
25Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche.
26Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”
27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.