24Ka onye ọbụla hapụ ịchọ ọdịmma nke onwe ya, kama ọdịmma nke ndị ọzọ.
25Rie ihe bụ anụ ọbụla e rere nʼahịa na-ajụghị ajụjụ ọbụla nʼihi akọnuche.
26Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”
27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.
28Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.