26Nʼihi na, “Ụwa na ihe niile dị nʼime ya bụ nke Onyenwe anyị.”
27Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ unu oriri, unu kpebie ije, riekwanụ nri ọbụla e nyere unu na-ajụghị ajụjụ nʼihi akọnuche.
28Ma ọ buru na e nwee onye gwara gị, “A chụrụ ihe a nʼaja.” Unu erila nri ahụ, maka onye ahụ mere ka unu mata, na nʼihi akọnuche.
29Akọnuche nke m na-ekwu maka ya abụghị nke gị, kama ọ bụ maka nke onye ahụ. Nʼihi gịnị ka mnwere onwe m ga-eji bụrụ ihe akọnuche onye ọzọ ga-ekpe ikpe?
30Ọ bụrụ na m nwere ike inye ekele, were nri m rie, olee otu e si ekwutọ m nʼihi ihe ahụ m nyere Chineke ekele banyere ya?