1 Ndị Kọrint 14

Nʼihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ nke udo. Otu a ka ọ dị nʼime ọgbakọ niile nke ndị nsọ.

1 Corinthians 14:33 (UKJV) For God is not the author of confusion, but of peace, as in all churches of the saints.

31Nʼihi na unu nwere ike ibu amụma nʼotu nʼotu, ka mmadụ niile nwee ike ịmụta ihe ma bụrụkwa ndị a gbara ume.

32Mmụọ niile nke ndị amụma ka a na-edokwa nʼokpuru ndị amụma.

33Nʼihi na Chineke abụghị Chineke nke aghara, kama ọ bụ nke udo. Otu a ka ọ dị nʼime ọgbakọ niile nke ndị nsọ.

34Ụmụ nwanyị ekwesighị ikwu okwu nʼime chọọchị. Ha ekwesighị itinye ọnụ na ntụgha ụka ọbụla, nʼihi na iwu kwuru ka ha debe onwe ha nʼokpuru ndị ọchịchị.

35Ọ bụrụ na ọ dị ihe ha chọrọ ịmata, ha jụọ di ha mgbe ha lara nʼụlọ. Nʼihi na ọ bụ ihe ihere na nwanyị ga-ekwu okwu nʼime ọgbakọ chọọchị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.