2Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesiri ka ndị na-elekọta ihe ọbụla bụrụ ndị kwesiri ntụkwasị obi.
3Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m maọbụ ihe a na-ekpe nʼụlọikpe nke mmadụ. Nʼezie, anaghị m ekpekwa onwe m ikpe.
4O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye ikpe na-amaghị. Ọ bụ Onyenwe anyị naanị ka ọ dịrị ikpe m ikpe.
5Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.
6Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya.