1 Ndị Kọrint 4

Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya.

1 Corinthians 4:6 (UKJV) And these things, brethren, I have in a figure transferred to myself and to Apollos for your sakes; that all of you might learn in us not to think of men above that which is written, that no one of you be puffed up for one against another.

4O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye ikpe na-amaghị. Ọ bụ Onyenwe anyị naanị ka ọ dịrị ikpe m ikpe.

5Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.

6Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya.

7Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata?

8Ma ugbu a, ihe niile zuru unu oke. Ugbu a, unu abụrụkwala ndị ọgaranya. Unu abụrụla eze ma anyị esoghị unu. Nʼezie, ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu anọrọla nʼocheeze unu, ka anyị nwe ike soro unu bụrụ eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.