1 Ndị Kọrint 4

Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.

1 Corinthians 4:5 (UKJV) Therefore judge nothing before the time, until the Lord come, who both will bring to light the hidden things of darkness, and will make manifest the counsels of the hearts: and then shall every man have praise of God.

3Anaghị m echegbu onwe m banyere ihe unu na-eche gbasara m maọbụ ihe a na-ekpe nʼụlọikpe nke mmadụ. Nʼezie, anaghị m ekpekwa onwe m ikpe.

4O doro m anya na akọnuche m adịghị ama m ikpe, ma nke a egosighị na m bụ onye ikpe na-amaghị. Ọ bụ Onyenwe anyị naanị ka ọ dịrị ikpe m ikpe.

5Ya mere, unu ekpela ikpe tupu oge ya eruo, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abịa. Ọ ga-eme ka ihe niile zoro ezo nʼọchịchịrị pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo niile nke dị nʼobi nʼanwụ. Mgbe ahụ, onye ọbụla nʼotu nʼotu ga-anatakwa otuto ruuru ya site nʼaka Chineke.

6Ugbu a ụmụnna m ejiri m onwe m na Apọlọs mara unu atụ maka ọdịmma nke unu, ka unu nwee ike isite nʼaka anyị mụta ihe site nʼihe ahụ e dere bụ nke na-asị, “Unu agafekwala ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ.” Ka onye ọbụla nʼime unu hapụ iji otu onye nyaa isi ma leda ndị ọzọ anya.

7Onye gwara gị na ị pụrụ iche nʼetiti mmadụ ndị ọzọ? Ọ dị ihe ọbụla i nwere nke abụghị ihe ị natara anata? Ọ bụ gịnị ka i nwere nke ị na-anataghị anata? Ma ọ bụrụ na i natara ya, gịnị mere i ji anya isi dịka a ga-asị na ị nataghị ya anata?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.