1 Ndị Kọrint 7

Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.

1 Corinthians 7:2 (UKJV) Nevertheless, to avoid fornication, let every man have his own wife, and let every woman have her own husband.

1Ugbu a, okwu banyere ihe unu dere nʼakwụkwọ: “Ọ dị mma ka nwoke ghara ịmetụ nwanyị aka.”

2Ma nʼihi ọtụtụ ihe omume banyere ịkwa iko, ka nwoke ọbụla nwee nwunye nke aka ya, nwanyị ọbụla di nke aka ya.

3Ka nwoke ọbụla jisie ike na-akwụ nwunye ya ụgwọ mmekọ o ji ya. Nwanyị ọbụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.

4Nʼihi na nwanyị ọbụla lụrụ di adịghịkwa achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwunye ya na-achị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.