1 Ndị Kọrint 7

Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

1 Corinthians 7:32 (UKJV) But I would have you without carefulness. He that is unmarried cares for the things that belong to the Lord, how he may please the Lord:

30Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.

31Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.

32Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

33Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.

34Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.