29Ihe unu kwesiri ịma, ụmụnna, bụ na oge anyị nwere fọdụrụ naanị ntakịrị, site ugbu a gaa nʼihu ndị nwere nwunye ga-adị ndụ ha dịka ndị na-enweghị.
30Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dịka ndị ihe anaghị ewute, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dịka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọbụla.
31Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.
32Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.
33Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.