1 Ndị Kọrint 7

Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.

1 Corinthians 7:33 (UKJV) But he that is married cares for the things that are of the world, how he may please his wife.

31Ka ndị na-etinye oge nʼihe ụtọ nke ụwa hapụ ibi ndụ ịchọ iritecha ihe niile dị nʼụwa nʼuru. Nʼihi na ụwa, otu ọ dị ugbu a, bụ ihe na-agabiga agabiga.

32Unu emela ihe ga-ewetara unu oke echiche. Nwoke na-alụbeghị nwanyị nwere ohere iji oge ya niile rụọra Onyenwe anyị ọrụ. O nwekwara ohere ịgbalịsị ike ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

33Ma nwoke nwere nwunye na-echegbu onwe ya banyere ihe igbo mkpa nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ nwunye ya ụtọ.

34Ọ na-enwekwa obi abụọ nʼihe ọbụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nye nwaagbọghọ na-alụbeghị di maọbụ onye nke na-amabeghị nwoke, nchegbu ya bụ banyere ihe nke Onyenwe anyị. Ọchịchọ ya bụ ka ọ dị nsọ nʼanụ ahụ ya na nʼime mmụọ ya. Ma nwanyị nwere di na-echegbu onwe ya banyere ihe nke ụwa a, otu ọ ga-esi mee ihe ga-atọ di ya ụtọ.

35Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.