1 Ndị Kọrint 7

Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.

1 Corinthians 7:37 (UKJV) Nevertheless he that stands steadfast in his heart, having no necessity, but has power over his own will, and has so decreed in his heart that he will keep his virgin, does well.

35Ana m ekwu ihe ndị a maka ọ dị mma nke unu onwe unu, ọ bụghị ịgbalị igbochi unu, kama ọ bụ ka unu nwee ike bie ndụ unu nʼụzọ kwesiri ekwesi, werekwa ịhụnanya zuruoke rụọra Onyenwe anyị ọrụ.

36Ọ bụrụ na nwoke ọbụla enweghị ike ijide onwe ya nʼihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya nʼebe nwaagbọghọ ya na ya kpebiri ịlụ nọ, ya mee ihe ọ na-achọ, o meghị mmehie ọbụla, ha lụọ di na nwunye.

37Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.

38Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.

39Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.