1 Ndị Kọrint 7

Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.

1 Corinthians 7:39 (UKJV) The wife is bound by the law as long as her husband lives; but if her husband be dead, she is at liberty to be married to whom she will; only in the Lord.

37Ma ọ bụrụ na onye ọbụla ekpebie nʼobi ya, ma nwee ike ijide onwe ya, ka o si nʼenweghị mmanye ọbụla idebe nwaagbọghọ e kwuru na ọ ga-alụ na-enweghị mmekọ ọbụla, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.

38Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.

39Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.

40Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.