38Ya mere, onye ahụ lụrụ nwaagbọghọ o kwuru na ọ ga-alụ mere nke ọma, ma onye kpebikwara na ọ gaghị alụ mekwara nke ọma karịa.
39Njikọta e jikọtara nwunye na di ya na-adị ire naanị mgbe di nwanyị dị ndụ. Ọ bụrụ na di ya anwụọ o nwere ike ịlụ di ọzọ, ma ọ lụọ ya nʼime Onyenwe anyị.
40Nʼuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nʼobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na mụ onwe m nwekwara Mmụọ nke Chineke.