5Ọ bụ na anyị enweghị ike iduru nwunye onye bụ onye kwere ekwe gaa ebe ọbụla anyị na-aga dịka ndị ozi ọzọ na-eme, na dịka ụmụnne Onyenwe anyị na Sefas na-emekwa?
6Ọ ga-abụ naanị mụ na Banabas bụ ndị na-enweghị ike ịhapụ ịrụ ọrụ maka ihe anyị ga na-eri?
7Olee onye agha unu maara nke na-esi nʼakpa ya akwụ onwe ya ụgwọ ọnwa? Ka ọ dị onye ọrụ ubi vaịnị unu maara nke na-adịghị eri mkpụrụ e si nʼubi ahụ weta? Olee onye ọzụzụ atụrụ unu maara nke na-adịghị aṅụ mmiri ara e si nʼigwe atụrụ ọ na-azụ apịpụta?
8Anaghị m ekwu ihe a nʼihi na ha bụ ihe na-eme ụbọchị niile nʼetiti ndị mmadụ? Akwụkwọ iwu, o kwukwaghị otu ihe ahụ?
9Nʼihi na e dere ya nʼiwu nke Mosis, “Ekechila ọnụ ehi mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ naanị ehi ka Chineke bu nʼobi kwuo okwu a?