9Onye ọbụla na-asị na ya nọ nʼìhè ma na-akpọ nwanna ya asị, na-anọ nʼọchịchịrị ruo ugbu a.
10Onye ọbụla na-ahụ nwanna ya nʼanya na-ebi nʼime ihe ahụ ọ dịkwaghị ìhè dị nʼime onye dị otu a bụ nke ga-eme ya ka ọ sụọ ngọngọ.
11Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì.
12Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
13Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.