11Ma onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị nọ nʼọchịchịrị, na-ejegharịkwa nʼime ọchịchịrị; ọ maghị ebe ọ na-aga nʼihi na ọchịchịrị ahụ emeela ka o kpuo ìsì.
12Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nʼihi na a gbagharala unu mmehie niile site nʼaha ya.
13Ana m edere unu ndị bụ nna ihe ndị a, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu emeriela ajọ onye ahụ.
14Ana m edere unu ụmụntakịrị, nʼihi na unu maara nna ahụ. Ana m edere unu ndị nna, nʼihi na unu maara onye ahụ na-adị site na mbụ. Ana m edere unu ụmụ okorobịa, nʼihi na unu siri ike, okwu Chineke na-ebikwa nʼime unu, unu emeriekwala ajọ onye ahụ.
15Kwụsịnụ ịhụ ụwa nʼanya, ya na ihe niile dị nʼụwa. Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ụwa nʼanya ịhụnanya nke Nna adịghị nʼime ya.