1 Jọn 3

Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi.

1 John 3:12 (UKJV) Not as Cain, who was of that wicked one, and slew his brother. And wherefore slew he him? Because his own works were evil, and his brother's righteous.

10Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.

11Nʼihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mmalite, ka anyị hụrịta onwe anyị nʼanya.

12Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi.

13Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị.

14Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.