12Ka anyị hapụ ịdị ka Ken, onye bụ nke ajọ onye ahụ, na onye gburu nwanne ya. Gịnị mere o ji gbuo ya? Ọ bụ nʼihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma nke nwanne ya ziri ezi.
13Ka ọ gharakwa iju unu anya ụmụnna m, na ụwa kpọrọ unu asị.
14Anyị matara na anyị esitela nʼọnwụ baa na ndụ nʼihi na anyị na-ahụ ụmụnna anyị nʼanya. Onye ọbụla na-adịghị ahụ ibe ya nʼanya na-anọgide nʼọnwụ.
15Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya.
16Ọ bụ otu a ka anyị sị mata ihe bụ ịhụnanya, na Jisọs tọgbọrọ ndụ ya nʼihi anyị. Anyị kwesikwara ịtọgbọ ndụ anyị nʼihi ụmụnna anyị.