1 Jọn 3

Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.

1 John 3:5 (UKJV) And all of you know that he was manifested to take away our sins; and in him is no sin.

3Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.

4Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu.

5Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.

6Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.

7Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.