1 Jọn 3

Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.

1 John 3:6 (UKJV) Whosoever abides in him sins not: whosoever sins has not seen him, neither known him.

4Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu.

5Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.

6Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.

7Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume.

8Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.