1 Jọn 3

Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.

1 John 3:8 (UKJV) He that commits sin is of the devil; for the devil sins from the beginning. For this purpose the Son of God was manifested, that he might destroy the works of the devil.

6Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.

7Ezigbo ụmụ m, unu ekwela ka onye ọbụla duhie unu, onye ọbụla na-eme ezi ihe bụ onye ezi omume dị ka ya onwe ya bụ onye ezi omume.

8Onye ọbụla na-eme mmehie bụ nwa ekwensu, nʼihi na ekwensu bụ onye mmehie site na mmalite. Ihe mere Ọkpara Chineke jiri pụta ìhè bụ ka ọ laa ọrụ niile nke ekwensu nʼiyi.

9Onye a mụrụ site na Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie, nʼihi na mkpụrụ Chineke na-anọgide nʼime ya, ha enweghị ike ịnọgide na-eme mmehie, nʼihi na a mụrụ ha site na Chineke.

10Otu a ka anyị si amata ndị bụ ụmụ Chineke, na ndị bụ ụmụ ekwensu: Onye ọbụla na-adịghị eme ihe ziri ezi abụghị nwa Chineke, otu a ka ọ dịkwa onye na-adịghị ahụ ụmụnna ha nʼanya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.