2Ndị hụrụ nʼanya, ugbu a anyị abụrụla ụmụ Chineke. Ọ bụ ezie na anyị enweghị ike ịghọta ihe ọnọdụ anyị ga-abụ nʼoge dị nʼihu, ma anyị maara nke ọma na mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè, a ga-emekwa ka anyị bụrụ ndị yiri ya, nʼihi na anyị ga-ahụ ya dịka ọ dị.
3Onye ọbụla nwere olileanya dị otu a kwesiri idebe onwe ya ọcha, dị ka ya onwe ya dị ọcha.
4Onye ọbụla na-eme mmehie na-emebi iwu. Nʼezie mmehie bụ mmebi iwu.
5Unu maara na e mere ka ọ pụta ìhè iwepụ mmehie. Ọ dịkwaghị mmehie ọbụla dị nʼime ya.
6Onye ọbụla na-anọgide nʼime ya adịghị ebi ndụ ime mmehie, onye ọbụla nke na-ebi ndụ mmehie ahụbeghị ya anya mgbe ọbụla, ọ matabekwaghị ya.