6Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm.
7Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya tinyere Abịata onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze.
8Ma Zadọk onye nchụaja, Benaya nwa Jehoiada, Netan onye amụma, Shimei, Rei na ndị agha niile na-eche Devid nche esonyeghị Adonaịja.
9Adonaịja chịịrị atụrụ, ehi na ụmụ ehi gbara abụba, gaa nʼakụkụ En-Rogel chụọ aja na Nkume Zohelet. Ọ kpọrọ ụmụnne ya niile bụ ụmụ ndị ikom eze na ndịisi Juda niile, ndị na-ejere eze ozi oku,
10ma ọ kpọghị Netan onye amụma, maọbụ Benaya, maọbụ ndị agha niile na-eche Devid nche. Ọ kpọkwaghị Solomọn nwanne ya.