1 Ndị Eze 11

Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel.

1 Kings 11:12 (UKJV) Notwithstanding in your days I will not do it for David your father's sake: but I will rend it out of the hand of your son.

10Ọ bụ ezie na o nyere Solomọn iwu ka ọ ghara ịgbaso chi ndị ọzọ, ma Solomọn erubeghị isi nʼiwu a Onyenwe anyị nyere.

11Ya mere, Onyenwe anyị gwara Solomọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, jụ idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m, nke m nyere gị idebe, aghaghị m isite nʼaka gị dọkapụ alaeze a, were ya nye otu nʼime ndị na-ejere gị ozi.

12Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel.

13Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”

14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.