12Ma nʼihi nna gị Devid agaghị m eme ihe ndị a mgbe ị dị ndụ. Aga m anapụ nwa gị nwoke alaeze Izrel.
13Ma agaghị m anapụcha ya alaeze Izrel niile, kama aga m eme ka ọ bụrụ eze otu ebo Izrel, nʼihi Devid, na nʼihi Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m.”
14Mgbe ahụ, Onyenwe anyị mere ka onye iro bilie megide Solomọn. Onye a bụ Hadad onye Edọm, onye sikwa nʼezinaụlọ ndị eze Edọm.
15Nʼoge gara aga, mgbe Devid na-ebuso ndị Edọm agha, Joab, onyeisi ndị agha, onye gara ili ndị agha e gburu egbu, tigburu ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
16Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm.