16Joab na ndị agha Izrel niile nọgidere nʼebe ahụ ọnwa isii, tutu ruo mgbe ha gbuchapụrụ ndị ikom niile nọ nʼEdọm.
17Ma Hadad, onye bụ nwantakịrị nʼoge ahụ, gbapụrụ ọsọ gbaga Ijipt, ya na ụfọdụ ndịisi ọchịchị Edọm, ndị jeere nna ya ozi.
18Ha sitere nʼala Midia gaa Paran. Site na Paran, ha duuru ụfọdụ ndị mmadụ, ndị sooro ha gaa Ijipt, jekwuru Fero eze Ijipt, onye nyere Hadad ụlọ obibi na ala, nyekwa ya ihe oriri.
19Hadad hụtara amara nʼihu Fero, nke mere na ọ kpọnyere ya nwanne nwanyị Tapenes bụ nwunye eze ka ọ bụrụ nwunye ya.
20Nwanne Tapenes mụtara ya nwa nwoke aha ya bụ Genubat, onye Tapenes zụlitere nʼụlọeze. Genubat biri nʼetiti ụmụ Fero.