21Mgbe Hadad nọ nʼIjipt, ọ nụrụ na Devid sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ na Joab ọchịagha ndị agha anwụọkwala, ọ rịọrọ Fero arịrịọ ka o kwenye ka ọ laghachi nʼEdọm.
22Fero jụrụ ya ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji chọọ ịla? O nwere ihe ị chọrọ nke ị na-adịghị enweta nʼebe a?” Hadad zara sị ya, “O nweghị ihe kọrọ m, kama kwere ka m laghachi.”
23Nwoke ọzọ Chineke mere ka ọ bụrụ onye iro Solomọn bụ Rezon nwa Eliada, onye gbapụrụ site nʼaka nna ya ukwu bụ Hadadeza, eze Zoba.
24Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ.
25Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.