1 Ndị Eze 11

Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.

1 Kings 11:3 (UKJV) And he had seven hundred wives, princesses, and three hundred concubines: and his wives turned away his heart.

1Ma eze Solomọn hụrụ ọtụtụ ndị inyom mba ọzọ nʼanya, tinyere nwa nwanyị Fero, ha bụ ndị inyom ndị Moab, ndị Amọn, ndị Edọm, ndị Saịdọn na ndị Het.

2Ha bụ ndị sitere na mba ndị ahụ Onyenwe anyị gwara Izrel sị, “Unu na ha agaghị alụrịtakwa di na nwunye, nʼihi na ha aghaghị ime ka obi unu gbasoo chi niile ha.” Ma, nʼagbanyeghị nke a, Solomọn rapara ha nʼahụ nʼihi ịhụnanya.

3Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.

4Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere.

5Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.