3Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.
4Mgbe Solomọn ghọrọ agadi, ndị inyom ndị a duhiere obi ya mee ka ọ gbasoo chi ndị ọzọ, nke mere na o jikwaghị obi ya niile gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka Devid bụ nna ya mere.
5Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.
6Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.
7Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.