1 Ndị Eze 11

Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.

1 Kings 11:7 (UKJV) Then did Solomon build an high place for Chemosh, the abomination of Moab, in the hill that is before Jerusalem, and for Molech, the abomination of the children of Ammon.

5Ọ gbasoro Ashtọret, bụ chi ndị Saịdọn na Molek, bụ chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.

6Nʼụzọ dị otu a, Solomọn mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O soghị ụzọ Onyenwe anyị dịka nna ya Devid si mee nʼụbọchị niile nke ndụ ya.

7Nʼelu ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Jerusalem, Solomọn wuru ebe dị elu nye Kemosh, chi rụrụ arụ nke ndị Moab, wuokwara Molek chi rụrụ arụ nke ndị Amọn.

8O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.

9Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.