1 Ndị Eze 12

Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.

1 Kings 12:25 (UKJV) Then Jeroboam built Shechem in mount Ephraim, and dwelt therein; and went out from thence, and built Penuel.

23“Gwa Rehoboam, nwa Solomọn eze Juda, na ndị Juda niile, na Benjamin na ndị ọzọ niile, sị ha,

24Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu agakwala gaa buso ụmụnna unu, bụ ndị Izrel agha. Laghachinụ, nwoke ọbụla nʼụlọ ya, nʼihi na ọ bụ m na-eme nke a.’ ” Ya mere, ha rubere isi nʼokwu Onyenwe anyị, onye ọbụla nʼime ha laghachikwara nʼụlọ ya dịka Onyenwe anyị nyere nʼiwu.

25Mgbe ahụ, Jeroboam wusiri Shekem dị nʼala ugwu Ifrem ike, biri nʼebe ahụ. Nʼebe ahụ ka o si pụọ, gaa wuo obodo Peniel.

26Ma Jeroboam chere nʼobi ya, sị “Ugbu a, ka alaeze nwere ike laghachikwa nʼaka ụlọ Devid.

27Nʼihi na ọ bụrụ na ndị mmadụ gaa ịchụ aja nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị nke dị na Jerusalem, obi ha nwere ike laghachikwuru onyenwe ha, bụ Rehoboam eze Juda. Ha ga-egbu m, laghachikwuru eze Rehoboam.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.