1 Ndị Eze 13

Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya.

1 Kings 13:24 (UKJV) And when he was gone, a lion met him by the way, and slew him: and his carcass was cast in the way, and the ass stood by it, the lion also stood by the carcass.

22Ị laghachikwara nʼebe a, rie nri, ṅụọkwa mmiri, bụ ebe ọ gwara gị sị gị, erila nri, aṅụkwala mmiri. Ya mere, agaghị eli ozu gị nʼala ili nna gị ha.’ ”

23Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ.

24Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya.

25Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.

26Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu Onyenwe anyị. Onyenwe anyị enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu Onyenwe anyị dọrọ ya aka na ntị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.