23Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ.
24Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya.
25Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.
26Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu Onyenwe anyị. Onyenwe anyị enyefeela ya nʼaka ọdụm, nke dọgburu ma gbukwaa ya, dịka okwu Onyenwe anyị dọrọ ya aka na ntị.”
27Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a.