27Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a.
28Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ.
29Onye amụma agadi ahụ buliri ozu onye nke Chineke ahụ dọkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya bughachi ya nʼobodo, nʼihi iruru ya ụjụ, nakwa ili ya.
30O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!”
31Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya.