1 Ndị Eze 13

Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.

1 Kings 13:5 (UKJV) The altar also was rent, and the ashes poured out from the altar, according to the sign which the man of God had given by the word of the LORD.

3Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.”

4Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ.

5Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.

6Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ Onyenwe anyị Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ Onyenwe anyị site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ.

7Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.