1 Ndị Eze 13

Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”

1 Kings 13:7 (UKJV) And the king said unto the man of God, Come home with me, and refresh yourself, and I will give you a reward.

5Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.

6Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ Onyenwe anyị Chineke gị, kpekwara m ekpere ka e nyeghachi m aka m.” Ya mere, onye nke Chineke ahụ rịọrọ Onyenwe anyị site nʼekpere, emekwara ka aka eze dịghachi dịkwa ka ọ dị na mbụ.

7Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”

8Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a.

9Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.