1Nʼoge a, Abija nwa Jeroboam nọ nʼọrịa nke dị ukwuu.
2Nʼihi ya, Jeroboam sịrị nwunye ya, “Gaa, jikwaa onwe gị nʼụzọ mmadụ na-enweghị ike ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam. Ị ga-ejekwa Shaịlo, Ahija onye amụma nọ nʼebe ahụ, bụ nwoke ahụ gwara m okwu na m ga-abụ eze ndị nke a.
3Chịrịkwa ogbe achịcha iri, na achịcha nta ole na ole, na otu karama mmanụ aṅụ, jekwuru ya. Ọ ga-agwa gị ihe ga-eme banyere nwantakịrị a.”
4Nwunye Jeroboam mere ihe o kwuru, o biliri jee nʼụlọ Ahija na Shaịlo. Ahija bụ agadi nwoke nʼoge a. Ọ naghị ahụkwa ụzọ nʼihi nka ọ kara.