5Ma Onyenwe anyị agwalarị Ahija okwu sị ya, “Nwunye Jeroboam na-abịa ịjụta ase nʼaka gị banyere nwa ya nwoke ahụ na-adịghị ike, ọsịsa dị otu a ka i ganye ya. Mgbe ọ ga-abịa ịhụ gị ọ ga-eme onwe ya dịka ọ bụghị nwunye Jeroboam.”
6Mgbe Ahija nụrụ ụda nzọ ụkwụ ya ka ọ na-abata nʼọnụ ụzọ, ọ kpọrọ ya oku sị ya, “Bata, nwunye Jeroboam. Gịnị mere i ji jie ejiji dịka onye ọzọ? Enwere m akụkọ ọjọọ m ga-akọrọ gị
7Ga gwa Jeroboam sị ya, Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Esi m nʼetiti ndị m welie gị elu, mee gị ka ị bụrụ onye ga-achị ndị m, bụ Izrel.
8Adọwapụrụ m alaeze Izrel site nʼụlọ Devid nye gị ya, ma ị geghị ntị nʼiwu m, maọbụ debe ha dịka ohu m Devid debere ihe niile m nyere ya nʼiwu. Onye echiche obi ya na ihe na-atọ obi ya ụtọ mgbe niile bụ idebe iwu m, na ime ihe ziri ezi nʼanya m.
9Ma ihe ọjọọ i mere adịla ukwuu karịa nke ndị niile bu gị ụzọ bụrụ eze mere. Ị kpụọlara onwe gị chi ndị ọzọ, chi ndị e ji ọla kpụọ, si otu a kpasuo m iwe, gbakụta m azụ gị.