22Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel.
23Asa, eze Juda anọọla iri afọ atọ na otu dịka eze mgbe Omri malitere ịbụ eze Izrel. Omri chịrị Izrel afọ iri na abụọ, afọ isii nʼime afọ ndị a na Tịaza.
24Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.
25Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ.
26Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha.