24Omri zụrụ ala ugwu ugwu a na-akpọ Sameria site nʼaka Shema, kwụọ ya talenti ọlaọcha abụọ. O wuru obodo ọhụrụ nʼugwu ahụ gụọ aha ya Sameria, nʼihi na aha onyenwe ala ahụ na mbụ bụ Shema.
25Ma Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze Izrel niile buru ya ụzọ.
26Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dịka Jeroboam nwa Nebat mere. O dubakwara ndị Izrel nʼime mmehie. Nʼihi nke a o mere ka iwe wee Onyenwe anyị, Chineke Izrel, nʼihi arụsị nzuzu ha.
27Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
28Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.