32O guzobere ebe ịchụ aja nye Baal, nʼụlọ arụsị Baal nke o wuru na Sameria.
33Ehab manyere ogidi chi Ashera, si otu a kpasuo Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel iwe karịa otu ndị eze Izrel niile bu ya ụzọ chịa si mee.
34Mgbe Ehab na-achị, ka Hiel, onye Betel, wughachiri obodo Jeriko. Ọkpara ya bụ Abiram nwụrụ, mgbe ọ tọrọ ntọala obodo ahụ, ka ọ guzobere ọnụ ụzọ ama ya ọtọ, nwa ya nwoke nke nta aha ya bụ Segub nwụrụ, imezu okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Joshua nwa Nun.