1Ugbu a, Ịlaịja onye Tishbe, onye si obodo Tishbe, nke dị nʼala Gilead, sịrị Ehab, “Eji m aha Onyenwe anyị Chineke Izrel dị ndụ, onye m na-efe na onye m na-ejere ozi na-agwa gị na igirigi agaghị ada, mmiri agaghị ezo ọzọ nʼafọ ndị a na-abịa karịa ma ọ bụghị naanị site nʼokwu ọnụ m!”
2Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya,
3“Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan.