6Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze.
7Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ.
8Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.
9Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke.
10Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.