7Ma ozi Onyenwe anyị si nʼọnụ Jehu onye amụma, nwa Hanani bịara Baasha na ndị ezinaụlọ ya nʼihi ihe ọjọọ niile o mere, si otu a kpasuo Onyenwe anyị iwe. Ọ bụ ezie na ọ maara na Onyenwe anyị kpochapụrụ ezinaụlọ Jeroboam nʼihi ihe ọjọọ o mere, ma Baasha gara nʼihu mee ihe ọjọọ.
8Ela, nwa Baasha, malitere ịbụ eze Izrel nʼiri afọ abụọ na isii nke ịbụ eze Asa, eze Juda. Ma naanị afọ abụọ ka ọ chịrị dịka eze na Tịaza.
9Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke.
10Zimri batara kụdaa ma gbukwaa ya. Ọ bụ nʼiri afọ abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda. Ọ bụụrụ eze nʼọnọdụ ya.
11Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile.