1Ehab kọọrọ Jezebel ihe niile Ịlaịja mere, na otu o si jiri mma agha gbuo ndị amụma Baal niile.
2Nʼihi nke a, Jezebel zigara onyeozi ka ọ ga zie Ịlaịja sị, “Ka chi ndị a mesoo m mmeso, nʼagbanyeghị otu mmeso ahụ si dị njọ, ma ọ bụrụ na oge dịka oge a echi, egbughị gị dịka i si gbuo ndị amụma Baal.”
3Ịlaịja tụrụ egwu, gbapụ ọsọ, nʼihi ichebe ndụ ya. Mgbe ọ bịaruru Bịasheba, dị na Juda, ọ hapụrụ nwokorobịa na-ejere ya ozi nʼebe ahụ.
4Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.”